Isaiah 13

Amụma e buru megide Babilọn

1Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.

2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.
Kpọkuonụ ndị agha.
Feerenụ ha aka,
ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;
akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.
E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.

4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.
Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.
Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya
na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.
Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị
na-abịa imebi ala ahụ niile.

6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.

9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, b
nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.

14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha
dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,
maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.

17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,
maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
19Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
ịma mma na ebube ndị Kaldịa,
mgbe Chineke ga-akwatu ya
ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
20Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.
Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;
ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
21Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,
na ikwighịkwighị,
nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
22A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.
Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.
Lee na oge ha ji emezu adịla nso,
a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
Copyright information for IboBIU